Mmadụ kwesịrị ị taa nwa ya ahụhụ mgbe mbụ o ji akwa we’re lọta, ma ọ bụghị ya, ụlọ agaghịkwa aba ùnu ụbọchị ọ ga e ji oké ọkpa lọta. #iluigbo #uncleib #okwuluora #igboamaka #Asụsụbeanyi
Ụtụtụ ọma Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, ọ ga adịrị anyị mma na eke, dịrị anyị mma na orie, dị kwara anyị mma na afọr na nkwo. anyị abola chi nke ọnye chiri ya zere. Mmiri ata la ma azụ anwụ la.
Ihe m jiri bịa na ụbọchị taa bụ okwu nke agba ume, makana asị na dibịa rijuo afọ ọ bụọ mgbọrọgwụ ná ajofia, nke bụ eziokwu bụ na ụwa anyị nọ na ime ya dị omimi.
Imerime ndị mmadụ a ga fụọ laa ụzọ ebe ha na achọ iru nke Chineke, ma ha chefuo na ikikere anyị dị na okwu ọnụ, nanị inwe okwukwe na nchekwube bụ zi nke na ara anyị arụ, ya mere nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị nwee okwukwe makana ọ tee aka ọ dị njọ e mesịa ọ ga adịkwa mma.
Okwukwe anyị agaghị a rapu anyị makana aha ọ bụla nke ị nyere nwa nkịta be gị ka ọ ga na azara gị, nke pụtara na okwukwe onye na azọ onye na ihi na nkụ nke dị na mba na e ghere mba nri.
Site na ihe onyonyo nke a anyị ga a mata na ọ bụghị osisi a tụrụ anya ya na ọ ga ada na e mesịa daa makana ebe ị ma nke a ịma nke ọzọ mere ọkụ jiri rapụlụ ite were gbụọ ihe dị ite na ime.
Na npiachi a gam achọ ka anyị we tụọ anya na ala were ghọta ihe onyonyo nke a kụziiri anyị makana a siri noo onwe nụ na eke, mana ọ bụghị onye asịrị ya nwụọ na anwụ.