Zuby Nwa afọ Igbo

  • Home
  • Zuby Nwa afọ Igbo

Zuby Nwa afọ Igbo Maka ịkwalite Asụsụ, Egwuregwu, Omenala na Ndụ ndị Igbo.

Ndị ọgbọ a agaghị aghọtacha!😩😩😂😂.©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.
23/06/2025

Ndị ọgbọ a agaghị aghọtacha!😩😩😂😂.

©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.

Ụmụ Igbo ibe m, biko, bịanụ ka anyị kpaa nkata🤲;Ọtụtụ mmadụ ka ọ na-abụ a sị ha na uwe ha yi adịchaghị mma etu o kwesịrị...
19/06/2025

Ụmụ Igbo ibe m, biko, bịanụ ka anyị kpaa nkata🤲;

Ọtụtụ mmadụ ka ọ na-abụ a sị ha na uwe ha yi adịchaghị mma etu o kwesịrị, ha asị na o nweghị ihe o mere. Ajụjụ anyị taa wee bụrụ:

1. Dị ka nwa agbọghọ, i nwere ike iyi ụdị akwa a soro onye na-achọ ịlụ gị gaa hụ nne na nna ya?🤔.
• Nwoke chọrọ ịlụ gị o nwere ike ịkwado etu a soro gị gaa hụ nne na nna gị?🤔.

2. Dị ka nwoke, I nwere ike ịkpụtu akwa gị etu a ma ọ bụ yiri nke e bere ikpere ya gaa hụ nne na nna nwata nwaanyị ị chọrọ ịlụ?.
• Nwata nwaanyị ị chọrọ ịlụ kwadoo etu a, ị ga-ekwe ka o soro gị gaa hụ nne na nna gị?🤔.

3. Dị ka onye nna ma ọ bụ nna, nwoke chọrọ ịlụ nwa gị nwaanyị ma ọ bụ nwaanyị nwa gị nwoke chọrọ ịlụ kwadoo etu a soro nwa gị bịa ịhụ gị, ị ga-ekwe ka ha abụọ lụọ?🤔.

©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.

Mmadụ ole chetara ite mmiri a??😌.O nwere ndị ị ma ka ji ya aṅụ mmiri?.©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.
19/06/2025

Mmadụ ole chetara ite mmiri a??😌.

O nwere ndị ị ma ka ji ya aṅụ mmiri?.

©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.

Kedụ etu i si arachadobe mango gị?😋🤔.©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.
19/06/2025

Kedụ etu i si arachadobe mango gị?😋🤔.

©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.

Anụrụ m na ọ bụ 'nwa bebi' a a kpọrọ 'LABUBU DOLL' bụ ahịa na-agbara ụmụ nwaanyị, ọ kachasị ụmụ agbọghọ ọkụ ugbu a!😮.Kep...
19/06/2025

Anụrụ m na ọ bụ 'nwa bebi' a a kpọrọ 'LABUBU DOLL' bụ ahịa na-agbara ụmụ nwaanyị, ọ kachasị ụmụ agbọghọ ọkụ ugbu a!😮.

Kepu kepu m na-anụ bụ na ọnụ ego naanị otu 'nwa bebi' a nọ n'agbata Puku narị Naịra abụọ na iri isii (₦260,000) na Puku narị Naịra atọ na ụma (₦300,000+)!😮.

M wee sị ka m jụọ, "Ọ bụzịkwa naanị bebi ụmụaka ji egwu bụ ihe a💁‍♂️, ka o nwere ihe ọzọ ụmụ agbọghọ anyị ji ya eme anyị amaghị??🤔🤔.

Bikonu, ụmụ nwaanyị, bịa zaanụ ajụjụ a!🙏🤔.

©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.

13/06/2025

:

Na agadi nwaanyị amaghị agba ọsọ abụghị ma mgbe ewu buuru mkpọ ụtaba ya!🤲😩😂.
©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.

Mgbe elu bụ ala ọsa, Ndị Igbo amaghị ihe bụ 'DNA Test' (Ya bụ; Ije mata ọbara onye nwata bu!😮.Ị chọkwahaala ịmata onye ị...
13/06/2025

Mgbe elu bụ ala ọsa, Ndị Igbo amaghị ihe bụ 'DNA Test' (Ya bụ; Ije mata ọbara onye nwata bu!😮.

Ị chọkwahaala ịmata onye ị bụ, gagodu kporo anụ ebe a mgbe o rubeghị gị ịhara anụ; ka ụmụnna gị gwa gị ụbọchị a mụrụ gị na onye tụrụ ime gị!🤲😂😹😹😂.

©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.

12/06/2025

:
Ụkpana ntị ike na-ezu ike n'afọ nnụnụ!.

©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.

12/06/2025

Ka ọnọdụ dị ugbu a na mba India ebe e nwere ihe mberede ụgbọelu🚨. ©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️. 📹♾BBC News Igbo.

KA O SI AKPỌTỤ!!🚨📢.Ndụ ihe karịrị mmadụ narị abụọ bụ nke nọ na nsogbu ugbu a dị ka ụgbọelu bu mmadụ dị narị abụọ na ụma ...
12/06/2025

KA O SI AKPỌTỤ!!🚨📢.

Ndụ ihe karịrị mmadụ narị abụọ bụ nke nọ na nsogbu ugbu a dị ka ụgbọelu bu mmadụ dị narị abụọ na ụma si mba India aga ọdụ ụgbọelu dị na Lọndọn kpọkasịrị onwe ya na mgbe na-adịghị anya o jiri felichaa; pụọ njem!.

Ka ọ dị ugbu a, ndị ọrụ 'gbata gbata🚨' ka na-agba mbọ ịma ma o nwere ndị a ga-azọpụtanwu isi ha.

©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.

.

12/06/2025

Taa bụ ụbọchị e ji echeta ọchịchị 'onye kwuo uche ya' na Naịjiria.

Chebiri ihe nkụzi dị n'ụdị ihe nkiri anyị ga-ewetara gị na mgbe na-adịghị anya banyere ọchịchị onye kwuo uche ya, ọ kachasị na Naịjiria🇳🇬.

©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.
12/6/2025.

.

Nwoke o kwesịrị ikwe nwaanyị n'aka n'omenala Igbo??🤔.Otu Ndị Eze na steeti Enugwu nọrọ ụnyaahụ chibe nwunye Onyeisi ala ...
11/06/2025

Nwoke o kwesịrị ikwe nwaanyị n'aka n'omenala Igbo??🤔.

Otu Ndị Eze na steeti Enugwu nọrọ ụnyaahụ chibe nwunye Onyeisi ala Naịjiria bụ Ork. Oluremi Tinubu echichi👑 'Ugosimba nke 1 n'Enugwu Steeti'.

Ụfọdụ mmadụ n'akụkụ nke ha na-akatọ echichi a, ebe, ụfọdụ na-ekwu na o rubere ya, ma, okwu a kpụ n'ọnụ ugbu a bụ ihe na-eme n'eserese a:

Bikonu, ụmụ Igbo be anyị, A bịa n'omenala Igbo, nwoke anaghị ekwe nwaanyị n'aka, onye ọ sọkwara ya nwaanyị ahụ bụrụ!.

Ọ jọgbukwara udele ma sigbuo nkakwụ na ndị okenye anyị nwere n'ala Igbo na-achọzị ịhapụ omenala anyị mebe 'Omenelu'!😩🤦‍♂️😩.

Udele sịrị okenye anwụla, ka ụmụaka ghara igbukpọ ha bụ Udele, kpọọ ha anụ oriri. Mana kedụzị ka o siri bụrụ ndị okenye anyị nwa kwesịrị ịkụziiri ndị ka na-etolite etolite ihe bụ omenala anyị na-akpọdozi omenala nwa isi n'ala?!!😩🤦‍♂️.

Okwu m na-agwa NDỊ OKENYE na NDỊ ECHICHI e nwere n'ala Igbo taa bụ nke a, mgbe ụnụ ga-amalite ịhụ ihe ọdị aṅaa n'omenala anyị, ya atụkwala unu n'anya ; ụnụ ejekwala achọba ebe mmiri siri baa n'opi ụgbọgụrụ maka na ọ bụ onye kpara nkụ ahụhụ sịrị ngwere pụkwute ya ọrụ!. Chetakwanụ na onye nkụzi dechaa gbajie chọọkụ, nwata akwụkwọ dechaa, o tiwaa sileti!.

Ka o begodu m ebe a!!.

©️Zuby Nwa afọ Igbo✍️.

Address


Telephone

+2348105403734

Website

Alerts

Be the first to know and let us send you an email when Zuby Nwa afọ Igbo posts news and promotions. Your email address will not be used for any other purpose, and you can unsubscribe at any time.

Shortcuts

  • Address
  • Telephone
  • Alerts
  • Claim ownership or report listing
  • Want your business to be the top-listed Media Company?

Share